Psalms 79

Abụ Ọma Asaf.

Akwa nʼihi mbibi Jerusalem

1O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị;
ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị,
ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
2Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe
ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha,
werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
3Ha awụpụla ọbara dịka mmiri
nʼakụkụ niile nke Jerusalem,
ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ,
ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.

5O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?
Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị
dịka Chineke oke iwe gị,
bụ alaeze niile ndị ahụ
na-adịghị akpọku aha gị;
7nʼihi na ha eripịala Jekọb
mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.

8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere;
ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị,
nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
nʼihi ebube nke aha gị;
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile
nʼihi aha gị.
10Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”

Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,
na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
11Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ;
site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
12Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị
nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
13Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị
ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;
anyị ga na-ekwupụta otuto gị,
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Copyright information for IboBIU